Jeremiah 5

O nweghị onye na-eme ezi ihe

1“Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem,
legharịa anya, ma mara,
chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile.
Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye,
bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu.
M ga-agbagharakwa obodo a
2Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’
ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”

3 Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ?
Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ.
I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị.
Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume,
ha ajụla ịchịgharị.
4Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye
na ndị na-enweghị uche,
ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị,
na iwu nke Chineke ha.
5Aga m ejekwuru ndị ndu,
gwa ha okwu sị,
nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị,
marakwa iwu niile nke Chineke ha.”
Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ,
tijiekwa agbụ niile.
6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.
Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha
ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.
Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,
na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.

7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?”

10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị.
E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme!
Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị;
mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,
nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha.
Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
14Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,

“Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta,
aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ.
Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.
15Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu.
Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike,
nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha,
ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
16Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe;
ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.
17Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.
Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị.
Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu.
Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu.
Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike,
bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
18“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam. 19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’

20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,
kwusaa ya na Juda.
21Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,
na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”
“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?
Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.
Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.
Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.
Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
23Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
24Ha adịghị asị onwe ha,
‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,
ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
25Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.

26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,
dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
27Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,
ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ.
Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
28ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ;
ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi.
Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna;
ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
29M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”
ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ.
“M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a?

30“Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke
emeela nʼala a.
31Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha,
ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike,
ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya.
Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”
Copyright information for IboBIU